Psalms 126

Abụ nrigo.

Abụ ekele maka mgbapụta

1Mgbe Onyenwe anyị kpọghachitere ndị e mere ka ha lọta na Zayọn,
anyị dị ka ndị na-arọ nrọ.
2Ọchị juru anyị ọnụ,
abụ ọṅụ jukwara anyị ire.
Mgbe ahụ, e kwukwara ya na mba niile sị,
Onyenwe anyị emeerela ha ọtụtụ ihe dị ukwuu.”
3 Onyenwe anyị emeerala anyị ọtụtụ ihe dị ukwuu,
obi anyị jupụtakwara nʼọṅụ.

4Nyeghachi anyị akụnụba anyị, o Onyenwe anyị,
dịka mmiri iyi na-asọ nʼala Negev.
5Ndị niile na-eji anya mmiri na-arụ ọrụ ịkụ mkpụrụ
ga-emesịa jiri abụ ọṅụ wee ihe ubi ahụ.
6Onye ji ịkwa akwa
buru mkpụrụ ubi ọ ga-agha na-aga,
ga-emesịa jiri abụ ọṅụ na-alọghachi azụ,
mgbe ha bu ukwu ọka ha.
Copyright information for IboBIU